Izikiel 40

O mere ka m bịaruo na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ nke mpụta ọnụ ụlọ ahụ, o ruru mita abụọ na ụma atọ nʼobosara, nʼakụkụ ya abụọ. Ebe mbata ya ruru mita asaa na ụma anọ nʼobosara, ebe akụkụ aja ụlọ ahụ ruru otu mita na ụma isii nʼobosara, nʼotu akụkụ nakwa nʼakụkụ nke ọzọ ya.

Ezekiel 40:48 (UKJV) And he brought me to the porch of the house, and measured each post of the porch, five cubits on this side, and five cubits on that side: and the breadth of the gate was three cubits on this side, and three cubits on that side.

46Ọnụụlọ nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama chere ihu nʼugwu, bụ nke ndị nchụaja ndị na-eche ebe ịchụ aja nche. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Zadọk. Ọ bụ naanị ha ka e kwere ka ha nwee ike ịbịaru Onyenwe anyị nso, ijere ya ozi site nʼetiti ebo Livayị niile.”

47Mgbe ahụ, ọ tụrụ ogige ime ahụ, chọpụta na ogologo ya dị iri mita ise na asatọ. Obosara ya bụkwa otu ihe ahụ. Ebe ịchụ aja dịkwa nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ.

48O mere ka m bịaruo na mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ nke mpụta ọnụ ụlọ ahụ, o ruru mita abụọ na ụma atọ nʼobosara, nʼakụkụ ya abụọ. Ebe mbata ya ruru mita asaa na ụma anọ nʼobosara, ebe akụkụ aja ụlọ ahụ ruru otu mita na ụma isii nʼobosara, nʼotu akụkụ nakwa nʼakụkụ nke ọzọ ya.

49Ebe mpụta ọnụ ụlọ ahụ dị ihe ruru mita iri na otu nʼobosara, sitekwa nʼazụ ruo nʼihu ya ruru mita isii na ụma anọ. Ọ bụ ihe nrigo iri ka eji arịgo ya. Ogidi dịkwa nʼakụkụ ọnụ ụzọ abụọ ahụ otu nʼakụkụ nke a ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.