Izikiel 40

O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama,

Ezekiel 40:8 (UKJV) He measured also the porch of the gate within, one reed.

6Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara.

7Oghere dị nʼụlọ ahụ nke bụ ebe ndị nche na-anọ dị mita atọ nʼọkara nʼobosara. Mgbidi dị nʼetiti ha dị mita abụọ na ụma asaa nʼigbidi. Ebe e si abata na mpụta ọnụ ụzọ ama nke chere ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, dị mita atọ nʼọkara nʼomimi.

8O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama,

9ọ dị mita anọ na ụma abụọ nʼomimi. Ogidi dị nʼakụkụ ya dị otu mita nʼigbidi. Ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ụzọ ama ya chere ihu nʼụlọnsọ ukwu.

10Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.