Izikiel 40

Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ.

Ezekiel 40:10 (UKJV) And the little chambers of the gate eastward were three on this side, and three on that side; they three were of one measure: and the posts had one measure on this side and on that side.

8O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama,

9ọ dị mita anọ na ụma abụọ nʼomimi. Ogidi dị nʼakụkụ ya dị otu mita nʼigbidi. Ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ụzọ ama ya chere ihu nʼụlọnsọ ukwu.

10Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ.

11Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo.

12Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.