20Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ.
21Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.
22Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”
23Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
24Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu.