22Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”
23Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
24Ọnụ ụzọ ọbụla nwere ibo abụọ, ibo abụọ nke a na-akwagharị gburugburu.
25A tụnyere onyinyo cherubim na osisi nkwụ nʼelu ibo na-edubanye nʼụlọ ezumezu ahụ, dịka ndị ahụ a tụrụ nʼahụ mgbidi niile. E jikwa osisi rụchie elu ihu mpụta nke ọnụ ụlọ ahụ.
26Windo dị warawara dị nʼaja mpụta ọnụ ụlọ ahụ, nke e sekwasịrị oyiyi osisi nkwụ; ọnụụlọ nta niile nke ụlọnsọ ukwu ahụ nwekwara ihe a rụnyere nʼelu ụzọ ya, nke a machiri amachi.