Izikiel 43

Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ.

Ezekiel 43:21 (UKJV) You shall take the bullock also of the sin offering, and he shall burn it in the appointed place of the house, without the sanctuary.

19Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

20Unu ga-ewere ụfọdụ nʼọbara ya tee na mpi anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke mbadamba nkume dị nʼelu, na gburugburu ọnụ ọnụ ya, si otu a sachaa ebe ịchụ aja ahụ, kpuchikwaara ya mmehie.

21Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ.

22“Nʼụbọchị nke abụọ, ị ga-eji nwa mkpi na-enweghị ntụpọ chụọ aja mmehie. A ga-eme ka ebe ịchụ aja dị ọcha, dịka e ji oke ehi ahụ mee ka ọ dị ọcha.

23Mgbe i mechara mmemme nsacha ndị a, werekwa nwa oke ehi ọzọ nke na-enweghị ntụpọ, na nwa ebule site nʼigwe anụ nke na-enweghị ntụpọ chụọ aja.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.