21Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ.
22“Nʼụbọchị nke abụọ, ị ga-eji nwa mkpi na-enweghị ntụpọ chụọ aja mmehie. A ga-eme ka ebe ịchụ aja dị ọcha, dịka e ji oke ehi ahụ mee ka ọ dị ọcha.
23Mgbe i mechara mmemme nsacha ndị a, werekwa nwa oke ehi ọzọ nke na-enweghị ntụpọ, na nwa ebule site nʼigwe anụ nke na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
24Were ha jee chee nʼihu Onyenwe anyị, ka ndị nchụaja were nnu fesa ha dịka aja nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị.
25“Ụbọchị asaa, kwa ụbọchị ka ị ga-ewepụta otu mkpi, na nwa oke ehi, na nwa ebule site nʼigwe anụ ndị ahụ, chụọ aja mmehie. Ha niile ga-abụ ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị ntụpọ.