23Mgbe i mechara mmemme nsacha ndị a, werekwa nwa oke ehi ọzọ nke na-enweghị ntụpọ, na nwa ebule site nʼigwe anụ nke na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
24Were ha jee chee nʼihu Onyenwe anyị, ka ndị nchụaja were nnu fesa ha dịka aja nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị.
25“Ụbọchị asaa, kwa ụbọchị ka ị ga-ewepụta otu mkpi, na nwa oke ehi, na nwa ebule site nʼigwe anụ ndị ahụ, chụọ aja mmehie. Ha niile ga-abụ ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị ntụpọ.
26Ụbọchị asaa ka ha ga na-achụ aja ikpuchi mmehie nʼihi ebe ịchụ aja, mee ka ọ dị ọcha, site otu a doo ya nsọ.
27Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”