Izikiel 44

Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere.

Ezekiel 44:13 (UKJV) And they shall not come near unto me, to do the office of a priest unto me, nor to come near to any of my holy things, in the most holy place: but they shall bear their shame, and their abominations which they have committed.

11Ha ga-abụ ndị na-eje ozi nʼime ebe nsọ m, ndị nlekọta nke ọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwuu, na-ejekwa ozi nʼime ya; ha ga-egburu ndị m anụ e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ na nke aja ndị ọzọ, ha ga-eguzokwa nʼihu ha jeere ha ozi.

12Ma nʼihi na ha guzoro nʼihu arụsị jeere ha ozi, mee ka ụlọ Izrel daba na mmehie ikpere arụsị, nʼihi nke a, eweliela m aka elu na-aṅụ iyi na ha aghaghị ịta ahụhụ mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

13Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere.

14Ma aga m ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị ilekọta ụlọnsọ m dị nʼaka, nʼihi ịrụ ọrụ niile na ije ozi niile dị nʼime ya.

15“ ‘Ma ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk, ndị Livayị, ndị chegidere ebe nsọ m nche, mgbe Izrel niile sitere nʼebe m nọ kpafuo, ga-abịa nso ijere m ozi, ha ga-eguzo nʼihu m chụọ aja abụba na ọbara. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.