13Ha agaghị abịakwute m nso ije ozi dịka ndị nchụaja, maọbụ bịaruo nso ihe nsọ m niile ọbụla maọbụ onyinye m dị nsọ karịchasịa onyinye nsọ niile, ha aghaghị ibu ọnọdụ ihere nke ihe arụ niile ha mere.
14Ma aga m ahọpụta ha ka ha bụrụ ndị ilekọta ụlọnsọ m dị nʼaka, nʼihi ịrụ ọrụ niile na ije ozi niile dị nʼime ya.
15“ ‘Ma ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk, ndị Livayị, ndị chegidere ebe nsọ m nche, mgbe Izrel niile sitere nʼebe m nọ kpafuo, ga-abịa nso ijere m ozi, ha ga-eguzo nʼihu m chụọ aja abụba na ọbara. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
16Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche.
17“ ‘Mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama nke ogige dị nʼime, ha ga-eyi naanị akwa ọcha. Ha agaghị eyi uwe ọbụla e ji ajị anụ kpaa mgbe ha na-eje ozi nʼogige ime nke ụlọnsọ ukwu m.