Izikiel 44

Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime.

Ezekiel 44:21 (UKJV) Neither shall any priest drink wine, when they enter into the inner court.

19Mgbe ha na-apụ nʼogige dị nʼezi ebe ndị mmadụ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha yi mgbe ha na-eje ozi, hapụkwa ha nʼime ọnụụlọ nsọ ndị a, yiri uwe ọzọ, ka ha ghara ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị e doro nsọ site nʼimetụ uwe ha ahụ.

20“ ‘Ha agaghị ekwe ka agịrị isi ha too ogologo, ha agakwaghị akpụchapụ ya. Naanị mkpacha ka ha ga na-akpacha isi ha.

21Onye nchụaja ọbụla agaghị aṅụ mmanya vaịnị mgbe ọ na-abata nʼogige dị nʼime.

22Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ.

23Ha ga-akụziri ndị m ihe dị iche nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ; gosi ha otu esi amata ihe dị iche nʼetiti ihe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.