Izikiel 44

Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.

Ezekiel 44:26 (UKJV) And after he is cleansed, they shall reckon unto him seven days.

24“ ‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ.

25“ ‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di.

26Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.

27Ma nʼụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi nʼụlọ ukwu ahụ ịbanye nʼime ebe nsọ, ọ ga-ebu ụzọ chụọ aja mmehie nʼihi onwe ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

28“ ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.