25“ ‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di.
26Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.
27Ma nʼụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi nʼụlọ ukwu ahụ ịbanye nʼime ebe nsọ, ọ ga-ebu ụzọ chụọ aja mmehie nʼihi onwe ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
28“ ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.
29Ha ga-eri onyinye ịnata ihuọma, ihe aja mmehie, ihe aja ikpe ọmụma, ihe niile dị nʼIzrel e doro nsọ nye Onyenwe anyị ga-abụ nke ha.