Izikiel 44

Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.”

Ezekiel 44:3 (UKJV) It is for the prince; the prince, he shall sit in it to eat bread before the LORD; he shall enter by the way of the porch of that gate, and shall go out by the way of the same.

1Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi.

2Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi.

3Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.”

4Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.

5Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.