Izikiel 44

Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu.

Ezekiel 44:30 (UKJV) And the first of all the first-fruits of all things, and every oblation of all, of every sort of your oblations, shall be the priest's: all of you shall also give unto the priest the first of your dough, that he may cause the blessing to rest in yours house.

28“ ‘Ọ bụ naanị mụ onwe m bụ ihe nketa nke ndị nchụaja ga-enweta. Unu agaghị enye ha ihe nweta ọbụla nʼIzrel. Mụ onwe m bụ ihe nketa ha.

29Ha ga-eri onyinye ịnata ihuọma, ihe aja mmehie, ihe aja ikpe ọmụma, ihe niile dị nʼIzrel e doro nsọ nye Onyenwe anyị ga-abụ nke ha.

30Mkpụrụ mbụ kachasị mma site na mkpụrụ ubi ọbụla na onyinye niile pụrụ iche ga-abụ nke ndị nchụaja. Ọka mbụ a kwọrọ akwọ, nke a na-eweta nʼihe ubi ga-abụkwa nke ndị nchụaja, ime ka ngọzị dịkwasị nʼụlọ unu.

31Ndị nchụaja agaghị ata nnụnụ ọbụla, maọbụ anụ nke nwụrụ ọnwụ chi ya, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.