4Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
5Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, leruo anya nke ọma, gee ntị nke ọma nʼihe niile m na-agwa gị banyere iwu m niile na usoro niile nke ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Leruo anya nke ọma banyere ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọnsọ ukwu a, na nke ọpụpụ niile nke ebe nsọ a.
6Ị ga-agwa ndị Izrel bụ ndị ụlọ nnupu isi, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, o zuola bụ ibi ndụ arụ unu niile ahụ, unu ndị Izrel!
7Nʼihi na ọ bụghị naanị na ihe arụ unu mere dị ukwu, kama unu mekwara ihe arụ kachasị site nʼịkpọbata ndị ala ọzọ a na-ebighị anụ ahụ ha na obi ha ugwu nʼime ụlọnsọ, si otu a merụọ ụlọnsọ mgbe unu na-ewetara m nri nsọ, nke bụ abụba na ọbara. Nʼụzọ dị otu a, unu emebiela ọgbụgba ndụ m.
8Unu edebeghị iwu m nyere unu banyere ihe m ndị dị nsọ, kama unu goro ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-elekọta ebe nsọ m.