23Nʼụbọchị asaa nke mmemme ahụ, kwa ụbọchị, ọ ga-eweta oke ehi asaa na ebule asaa, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, dịka ihe ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ ga-enyekwa nwa mkpi kwa ụbọchị maka aja mmehie.
24Ọ ga-ewetakwa nʼihi onyinye ịnata ihuọma, narị lita ọka anọ na iri itoolu, nke bụ otu ọtụtụ otu oke ehi, otu ọtụtụ otu ebule. Tinyere lita mmanụ oliv atọ na ụma asatọ. Lita mmanụ atọ na ụma asatọ dịkwara otu efaf ọka.
25“ ‘Nʼoge mmemme ụbọchị asaa ahụ, nke ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, ọ ga-ewetakwa ihe a ga-eji chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na mmanụ.