16“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.
17Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ.
18Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’ ”
19Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ.
20Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”