20Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”
21Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla.
22Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu.
23Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ.
24Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”