16site ya ruo Berota na Sibraim (nke dị nʼoke ala dị nʼagbata Damaskọs na Hamat), rukwaa na Haza Hatikon, nke dị nʼoke ala Hauran.
17Oke ala ahụ ga-esite nʼoke osimiri gbasoro oke ala nke ugwu Damaskọs ruo Haza Enan. Oke ala ndị Hamat ga-adịkwa nʼakụkụ ugwu. Nke a ga-abụ oke ala nke akụkụ ugwu unu.
18Oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-esite nʼagbata Hauran na Damaskọs soro akụkụ osimiri Jọdan, nʼagbata ndị Gilead na ala ndị Izrel ruo nʼosimiri dị nʼọwụwa anyanwụ, ruokwa Tama. Nke a ga-abụkwa oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
19Oke ala na ndịda, ọ ga-esite na Tama ruo ọbụladị mmiri Meriba Kadesh, soro ụzọ ọdọ mmiri iyi Ijipt ruo osimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala ahụ na ndịda.
20Nʼọdịda anyanwụ, osimiri Mediterenịa ga-abụ oke ala, ruo na ncherita ihu ụzọ e si abata Hamat. Nke a bụ oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.