Izikiel 47

Keenụ ha ka ha bụrụ ihe nketa nye onwe unu, ma nyekwa ndị ọbịa bi nʼetiti unu, bụ ndị ọbịa niile mụtara ụmụ. Unu ga-agụ ha dịka ndị amụrụ nʼala Izrel. Ha ga-esokwa unu keta oke nʼihe nketa a na-ekenye ndị ebo niile nke Izrel.

Ezekiel 47:22 (UKJV) And it shall come to pass, that all of you shall divide it by lot for an inheritance unto you, and to the strangers that sojourn among you, which shall brought forth children among you: and they shall be unto you as born in the country among the children of Israel; they shall have inheritance with you among the tribes of Israel.

20Nʼọdịda anyanwụ, osimiri Mediterenịa ga-abụ oke ala, ruo na ncherita ihu ụzọ e si abata Hamat. Nke a bụ oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.

21“Ala niile dị nʼime oke ala ndị a, ka unu ga-eke nʼetiti onwe unu dịka ebo Izrel si dị.

22Keenụ ha ka ha bụrụ ihe nketa nye onwe unu, ma nyekwa ndị ọbịa bi nʼetiti unu, bụ ndị ọbịa niile mụtara ụmụ. Unu ga-agụ ha dịka ndị amụrụ nʼala Izrel. Ha ga-esokwa unu keta oke nʼihe nketa a na-ekenye ndị ebo niile nke Izrel.

23A ga-ekenye ndị ọbịa ihe nketa nʼebo ọbụla ha bi nʼetiti ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.