Izikiel 47

Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ.

Ezekiel 47:3 (UKJV) And when the man that had the line in his hand went forth eastward, he measured a thousand cubits, and he brought me through the waters; the waters were to the ankles.

1Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta,

2O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta.

3Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ.

4O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu.

5Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.