3Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ.
4O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu.
5Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee.
6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri.
7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ.