Izikiel 47

Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ.

Ezekiel 47:7 (UKJV) Now when I had returned, behold, at the bank of the river were very many trees on the one side and on the other.

5Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee.

6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri.

7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ.

8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ

9Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.