Izikiel 47

Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri.

Ezekiel 47:6 (UKJV) And he said unto me, Son of man, have you seen this? Then he brought me, and caused me to return to the brink of the river.

4O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu.

5Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee.

6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri.

7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ.

8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.