Izikiel 47

Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ

Ezekiel 47:8 (UKJV) Then said he unto me, These waters issue out toward the east country, and go down into the desert, and go into the sea: which being brought forth into the sea, the waters shall be healed.

6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri.

7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ.

8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ

9Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ.

10Ndị ọkụ azụ ga-eguzo nʼọnụ mmiri, site nʼEn-Gedi ruo nʼEn-Eglaim a gaghị enweta ebe a na-agbasa ụgbụ e ji egbu azụ. Azụ dị iche iche ga-adịkwa, dịka azụ osimiri Mediterenịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.