Izikiel 48

“Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

Ezekiel 48:23 (UKJV) As for the rest of the tribes, from the east side unto the west side, Benjamin shall have a portion.

21“Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha.

22Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin.

23“Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

24Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.

25Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.