22Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin.
23“Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.
24Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
25Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
26Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.