24Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
25Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
26Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
27Gad ga-enwe otu oke; ha na ndị Zebụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
28Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa.