26Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
27Gad ga-enwe otu oke; ha na ndị Zebụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ.
28Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa.
29“Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo Izrel niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
30“Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ,