Izikiel 48

Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn.

Ezekiel 48:33 (UKJV) And at the south side four thousand and five hundred measures: and three gates; one gate of Simeon, one gate of Issachar, one gate of Zebulun.

31ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke Izrel. Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama Ruben, ọnụ ụzọ ama Juda, na ọnụ ụzọ ama Livayị.

32Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.

33Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn.

34Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Gad, ọnụ ụzọ ama Asha, na ọnụ ụzọ ama Naftalị.

35“Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.