32Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.
33Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn.
34Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Gad, ọnụ ụzọ ama Asha, na ọnụ ụzọ ama Naftalị.
35“Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.’ ”