Izikiel 48

Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

Ezekiel 48:7 (UKJV) And by the border of Reuben, from the east side unto the west side, a portion for Judah.

5Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

6Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

7Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ.

8“Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya.

9“Ogologo ebe a ewepụtara iche nye Onyenwe anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.