1“Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu.
2Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.
3Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.