11Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ.
12Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha.
13“Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha.
14“Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.
15Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.