Izikiel 5

Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.

Ezekiel 5:15 (UKJV) So it shall be a reproach and a taunt, an instruction and an astonishment unto the nations that are round about you, when I shall execute judgments in you in anger and in fury and in furious rebukes. I the LORD have spoken it.

13“Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha.

14“Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.

15Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.

16Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị.

17Aga m ezitere gị oke ụnwụ na ajọ anụ ọhịa, ha ga-agbawa gị aka nwa, ọrịa ọjọọ na ọbara ga-esi nʼetiti gị gafee; aga m eji mma agha megide gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.