2Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.
3Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.
4Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile.
5“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.
6Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m.