1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, chee iru gị nʼugwu niile nke nʼIzrel, buo amụma megide ha,
3sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja.