12Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m.
13Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha.
14E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”