Izikiel 7

Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.

Ezekiel 7:20 (UKJV) As for the beauty of his ornament, he set it in majesty: but they made the images of their abominations and of their detestable things therein: therefore have I set it far from them.

18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.

19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.

20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.

21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.

22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.