23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
26Mbibi ga-esochi mbibi, akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi. Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma, ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị, ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
27Eze ga-eru ụjụ, nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe, aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu. Aga m emeso ha dịka omume ha si dị, aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị. “ ‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”