21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.
22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.
23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.