1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel: “ ‘Ọgwụgwụ! Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
3Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu. Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu; aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị, aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile.
4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
5“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.