Izikiel 8

Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”

Ezekiel 8:18 (UKJV) Therefore will I also deal in fury: mine eye shall not spare, neither will I have pity: and though they cry in mine ears with a loud voice, yet will I not hear them.

16O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ.

17Ọ sịrị m, “Ị hụla nke a, nwa nke mmadụ? Ọ bụ ihe dị nta nye ụlọ Juda, bụ ime ihe arụ niile ndị a ha na-eme nʼebe a? Ha ga-ejikwa ihe ike mejupụta ala, siri otu a na-akpasu m iwe mgbe niile? Lee ka ha si nọgide na-akparị m, na-etinye alaka nʼimi ha.

18Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.