Izikiel 9

Mgbe ahụ, a nụrụ m ka o ji oke olu kpọọ oku sị, “Bịanụ nso, unu bụ ndị ahọpụtara ilekọta obodo a, onye ọbụla jidekwa ngwa agha nʼaka ya.”

Ezekiel 9:1 (UKJV) He cried also in mine ears with a loud voice, saying, Cause them that have charge over the city to draw near, even every man with his destroying weapon in his hand.

1Mgbe ahụ, a nụrụ m ka o ji oke olu kpọọ oku sị, “Bịanụ nso, unu bụ ndị ahọpụtara ilekọta obodo a, onye ọbụla jidekwa ngwa agha nʼaka ya.”

2A hụrụ m ndị ikom isii si nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼakụkụ ebe dị elu na-apụta, nke chere ihu nʼugwu, onye ọbụla jikwa mma agha nʼaka ya. Otu onye nʼime ha yi uwe akwa ọcha, nyarakwa nwa akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya. Ha niile batara nʼime ụlọnsọ, guzokwa nʼakụkụ ebe ịchụ aja e ji bronz wuo.

3Ma ebube nke Chineke Izrel sitere nʼelu cherubim ndị ahụ, ebe ọ nọ na mbụ, bilie bịa guzokwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha bụ onye nya akpa ahụ nke ihe e ji ede ihe dị nʼime ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.