Izikiel 8

O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.

Ezekiel 8:7 (UKJV) And he brought me to the door of the court; and when I looked, behold a hole in the wall.

5Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, welie anya gị lee nʼụzọ nke ugwu.” Eweliri m anya m lee nʼụzọ ugwu, ma lee, nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ebe ịchụ aja, ahụrụ m oyiyi arụsị ekworo ka o guzo nʼakụkụ ugwu ya.

6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị na-ahụ ihe ha na-eme, arụ dị egwu nke ụlọ Izrel na-eme nʼebe a, ihe ndị ga-achụpụ m nʼebe dị anya site nʼebe nsọ m? Ma ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.”

7O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.

8Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ.

9Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.