Izikiel 8

Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.”

Ezekiel 8:9 (UKJV) And he said unto me, Go in, and behold the wicked abominations that they do here.

7O mere ka m guzo nʼọnụ ụzọ ogige ahụ, mgbe m lere anya, ahụrụ m oghere dị nʼaja ụlọ ahụ.

8Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ugbu a gwupuo aja ụlọ a.” Mgbe m gwupuru ya, ahụrụ m ọnụ ụzọ e si aba nʼebe ahụ.

9Ọ sịrị m, “Banye nʼime ka ị hụ ihe arụ ọjọọ niile nke ha na-eme nʼebe a.”

10Abanyere m hụ na ihe jupụtara nʼahụ ụlọ ahụ bụ naanị oyiyi e sere ese, nke ihe na-akpụ akpụ dịka agwọ dị iche iche, ngwere na anụmanụ rụrụ arụ dị iche iche, tinyekwara arụsị niile nke ụlọ Izrel na-efe.

11Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.