4ọ sịrị ya, “Bilie, jegharịa nʼokporoụzọ niile nke obodo Jerusalem, kakwasị akara nʼegedege ihu ndị niile na-akwa akwa na ndị niile na-asụ ude nʼihi ihe arụ niile nke a na-eme nʼime ya.”
5Anụkwara m ka ọ gwara ndị ọzọ, “Soronụ ya baa nʼime obodo, gbukwaanụ, unu emekwarala onye ọbụla ebere maọbụ ọmịiko.
6Gbuonụ ha niile, ndị okenye, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa, na ndị inyom, na ụmụntakịrị. Ma unu emetụkwala onye ọbụla nwere akara ahụ nʼihu ya. Malitenụ nʼebe a, nʼime ụlọnsọ ukwu m.” Ya mere, ha malitere igbu ndị okenye ndị nọ nʼihu ụlọnsọ.
7Ọ sịkwara ha, “Merụọnụ ụlọnsọ a! Werekwanụ ozu ndị unu gburu egbu tụjuo nʼime ogige ya! Gaanụ!” Ha pụrụ baa nʼime obodo, bido igbu ndị mmadụ.
8Mgbe ha nọ na-egbu ndị mmadụ maọbụ naanị m fọdụrụ, adara m nʼala kpuchie ihu m, tie mkpu akwa, sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Ị ga-esite nʼoke iwe ị na-eweso Jerusalem bibie ihe niile fọdụrụ nʼIzrel?”