Ezra 1

“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda.

Ezra 1:2 (UKJV) Thus says Cyrus king of Persia, The LORD God of heaven has given me all the kingdoms of the earth; and he has charged me to build him an house at Jerusalem, which is in Judah.

1Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,

2“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda.

3Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.

4Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.