Ezra 1

Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ”

Ezra 1:4 (UKJV) And whosoever remains in any place where he sojourns, let the men of his place help him with silver, and with gold, and with goods, and with beasts, beside the freewill offering for the house of God that is in Jerusalem.

2“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda.

3Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.

4Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ”

5Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge.

6Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.